Job 23

Okwu Job

1Mgbe ahụ, Job zara sị:

2“Ọ bụladị taa, mkpesa m dị ilu;
aka ya dị arọ megide m nʼagbanyeghị ịsụ ude m.
3A sịkwa na m maara ebe m ga-achọta ya;
a sịkwa na m nwere ike ijeru ebe obibi ya!
4Aga m edozi mkpesa m nʼusoro nʼihu ya
were ịrụ ụka mejuo ọnụ m.
5Aga m achọpụta ihe o ga-aza m
ma tuleekwa ihe ọ ga-agwa m.
6Ọ ga-eji ike dị egwu megide m?
Mba, ọ gaghị ebo m ebubo.
7Nʼebe ahụ, onye ziri ezi ga-eme mkpesa nʼihu ya.
Nʼebe ahụ, a ga-anapụtakwa m site nʼaka onye ikpe m rụọ mgbe ebighị ebi.

8“Ma ọ bụrụ na m agaa nʼọwụwa anyanwụ ọ nọghị nʼebe ahụ;
ọ bụrụ na m gaa nʼọdịda anyanwụ, agaghị m achọta ya.
9Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya,
mgbe ọ lọghachiri na ndịda anaghị m ahụkwa ya.
10Ma ọ maara ụzọ m na-aga,
mgbe ọ nwapụtasịrị m, aga m apụta dịka ọlaedo,
11ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya;
ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe.
12Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m;
a na m echekwa okwu ọnụ ya karịa nri nke m na-eri kwa ụbọchị.

13“Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya?
Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya.
14Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m,
ọ ka nwekwara nzube ndị ọzọ yiri nke a o dobere imegide m.
15Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya;
mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya.
16Chineke emeela ka obi m daa mba;
Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka m maa jijiji.
17Ma ọchịchịrị emeghị ka m mechie ọnụ m,
bụ oke ọchịchịrị nke kpuchiri ihu m.
Copyright information for IboBIU